Frequently Asked Questions (FAQ)

MMALITE / MBIDOWE

Kwado

Ọ bụrụ na I chọrọ enyemaka ma ọ bụ chọọ ịkpọtụrụ ndị Ayoba, biko gaa na Ayoba.me/contact

Mbudata na Nkwakọnye

Kedụ ka m ga-esi budata Ayoba?

  • Ayoba.me/download – (data efu); ma ọ bụ

Ị nwere ike ịga na weebụsaịtị Ayoba iji budata ngwa ahụ n’oge ọ bụla. Ọ bụrụ na ị bụ onye ojiarụ MTN ị g’enwe ike ibudata Ayoba n’efu, n’ejighi data gị.

  • Google Play store

ḷ nwekwarike ibudata Ayoba na Google Play Store. Naani mepee Play Store, chota Ayoba ma budata iji imalite iji Ayoba. 

Kedụ kam ga esi melite Ayoba?

ḷ nwerike imelite Ayoba na Google Play Store ma o bu

Ngwa Ayoba dị ugbu a maka ekwentị ndị Androidị (vashọn ndị ọzọ na-abịa n’oge na-adịghị anya!). Iji melite, gaa na Google play store, wee pịa kpatụ Menu aka > Ngwa & egwuregwu m aka. Kpatụ MMELITE nke na-esote Ayoba aka! Nzi ozi ozugbo n’efu.

N’aka nke ọzọ, gaa na Play Store ma chọọ Ayoba. Kpatanụ MMELITE n’okpuru Ayoba! Nzi ozi ozugbo n’efu.

Na weebụsaịtị nke ndị Ayoba

ḷ nwekwara ike imelite ngwa Ayoba gị na weebụsaịtị anyị, naanị gaa na Ayoba.me/download

Kedụ ka m ga-esi tinyechikwa Ayoba?

Iji tinyegharịa ngwa Ayoba,ị ga-ebu ụzọ hichapụ ya na ekwentị gị. Tupu i mee nka, anyị na atụ aro ị kwadoro nkata gị. Nanị kpatụ bọtịnụ menu aka, wee họrọ Ntọala, wee kpatụ Nhazi aka ma họrọ Nkata Ndabere.

Nke a ga-echekwa nkata gị n’urukpuru, ma kwe ka ị weghachi nkata gị niile ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Rịba ama na adịghị echekwa ndabere gị na na ngwaọrụ gị, yabụ ị ga-achọ ịnweta ohere na ịntanetị iji nkwado ndabere.

Biko soro usoro ndị a ka ihichapụ ma tinyegharịa Ayoba:

Nhọrọ 1:

  • Kpatụ ma pido aịkọn Ayoba na Ihuenyo ịsimbido ruo mgbe aịkọn bidoro imeghari
  • Kpatụ X dị na akuku aịkọn Ayoba aka
  • Kpatụ Hichapụ aka iji wepu ngwa ahụ na data ya niile.
  • Pịa bọtịnụ isimbido aka
  • Budatakwa Ayoba ọzọ site na Google Play Store
  • Weghachite ndabere nkata gị site na kpatụ bọtịnụ menu aka, wee họrọ Ntọala, wee pịa Nhazi ma họrọ Nkata Ndabere, ma weghachite.
  • ḷ nwekwara ike ịga na weebụsaịtị Ayoba ịjị budata ma tinye ngwa ahụ n’oge ọ bụla. Ọ bụrụ na ị bụ onye ojiarụ MTN ị ga-enwe ike ibudata Ayoba n’efu*, na-ejighị data gị.

*N’oge a na-eme nkwalite

Nhọrọ 2:

  • Kpatụ ma jide aịkọn Ayoba na Ihuenyo isimbido ma dọrọ ma dobe ya na ịkpo ahihia / Ebe a na-atufu ihe ndị weghapuru
    • Họrọ weghapu iji kwado nhichapụ ịwepu ngwa ahụ na data ya niile
    • Pịa bọtịn isimbido aka
    • Budataghachi Ayoba site na Google Play Store.
  • Weghachite ndabere nkata gị site na kpatụ bọtịnụ menu aka, wee họrọ Ntọala, wee pịa Nhazi ma họrọ Nkata Ndabere, ma weghachite.
  • ḷ nwekwara ike ịga na weebụsaịtị Ayoba ịjị budata ma tinye ngwa ahụ n’oge ọ bụla. Ọ bụrụ na ị bụ onye ojiarụ MTN ị ga-enwe ike ibudata Ayoba n’efu*, na-ejighị data gị.

*N’oge a na-eme nkwalite

Nnyocha

Kedụ ka m ga-esi nyochaa nọmba m?

Ozugbo ibudatara ngwa ahụ, mepee ya ma soro usoro ndị a:

  1. Tinye aha gị n’uju
  2. Họrọ mba gị site na ndepụta ndọpụta. Nke a pụtara na a ga etinye koodu obodo gị maka nọmba ekwentị gị na akpaghị aka
  3. Tinye nọmba ekwentị gị na igbe dị n’okpuru
  4. Kpatụ nyochaa aka iji were rịọ koodu
  5. Tinye koodu nọmba 6 ị nwetara site na SMS

Enwetaghị m koodu nọmba 6 site na SMS

  • Chere ka oge na-agụ gwụ ma họrọ Zipụ SMS ọzọ.
  • Akakwala koodu, a ga-akpochi akaụnt gị ọbere oge. Nke a bụ ihe nchekwa iji gbochie onye ọzọ ịnweta ohere na akaụntụ gị.

Ọ bụrụ na nsogbu ahụ na-aga n’ihu, biko nwalee ihe ndị a:

  • Bidogharịa ekwentị gị (Iji bidogharị ekwentị gị, gbanyụọ ya, chere ka 30 sekọnd ruo, ma gbanyekwa ya).
  • Hichapụ ma tinyeghachikwa vashọn Ayoba kacha dị ọhụrụ.

Enwere m ike iji Ayoba rụọ ọrụ n’ekwentị abụọ?

Enwere ike ịji naanị otu nọmba nyocha akaụntụ Ayoba gị na otu ngwaọrụ. Ọ bụrụ na ị nwere ekwentị na eji SIM abụọ, biko mara na ị ka ga-ahọrọ otu nọmba iji nyochaa ya na Ayoba. Enweghị nhọrọ iji nweta akaụntụ Ayoba na nọmba ekwentị abụọ.

Ekwesịrị m idebaye aha ọzọ ma ọ bụrụ na m wepụ ma weghachikwa ngwa ahụ?

Mba ị gaghị eme ya. Ihe ị ga – eme bụ ibudata Ayoba site na Google Play Store ma ọ bụ site na Ayoba.me/download. Tinye aha gị, họrọ obodo gị site na menu ndọpụta, tinye nọmba ekwentị gị wee họrọ nyochaa.

Rịba ama: ọ bụrụ na ị kwadoro nkata gị tupu ị hichapụ ngwa ahụ ma tinyegharịkwa ya, a ga eweghachite nkata gị nịịle na akpaghị aka.

I JI AYOBA WERE MEWE IHE

Njikwa akaụnt na profaịl

Kedụ kam ga-esi tinye ma ọ bụ melite foto profaịl m?

Ọ bụrụ na ịhọtabeghị foto profaịl:

1. Mepee menu nke dị n’elu n’aka ekpe ngwa ahụ

2. Kpatụ aịkọn nke edit aka

3. Kpatụ foto profaịl aka > aịkọn kamera

4. Họrọ foto na igwefoto gị iji were mee foto profaịl gị

Ọ bụrụ na ị nwere foto profaịl dị ugbu a:

  1. Mepee menu nke dị n’elu n’aka ekpe ngwa ahụ
  2. Kpatụ foto profaịl aka ma ọ bụ aịkọn nke edit
  3. Ị na-ahọrọ aịkọn nke edit, kpatụ foto profaịl aka > aịkọn kamera
  4. Họrọ foto na igwefoto gị iji were gbanwe foto profaịl gị

Enwere m ike ịmelite aha ngosịpụta m?

  1. Mepee menu nke dị n’elu n’aka ekpe ngwa ahụ
  2. Kpatụ aha ngosịpụta gị aka ma ọ bụ aịkọn nke edit iji were degharịa ma ọ bụ tinye aha ngosịpụta ọhụrụ gị

Kedụ kam ga-esi tinye ma ọ bụ melite ọnọdụ m?

  1. Mepee menu nke dị n’elu n’aka ekpe ngwa ahụ
  2. Kpatụ ọnọdụ gị aka ma ọ bụ aịkọn nke edit
  3. Tinye ọnọdụ ọhụrụ ma họrọ aịkọn nke tik iji kwenye, ma ọ bụ họrọ ọnọdụ site n’ime ọnọdụ ndị itinyere na mbụ. 

Rịba ama: Ọ bụrụ na ị igbochi kọntaktị, onye ahụ agaghị enwe ike ịhụ foto profaịl gị ma ọ bụ mmelite ọnọdụ gị.

Kedụ ka m ga-esi hichapụ akaụnt m?

Enwere nzọụkwụ ole na ole dị mfe iji soro ma ọ bụrụ na ị kpebiri ihichapụ akaụntụ gị. Rịba ama na usoro a agaghị agbanwe agbanwe n’ọnọdụ ọ bụla, ọbụna site na ndị òtù Ayoba, biko jide n’aka na nke a bụ ihe ịchọrọ ime.

Soro nzọụkwụ anọ a:

  1. Mepee ngwa nke Ayoba
  2. Mepee menu nke dị n’elu n’aka ekpe ngwa ahụ
  3. Kpatụ ntọala aka > Nlekọta > Hichapụ akaụntụ gị
  4. Kwenye site na ịpị OK

Ihichapụ akaụnt gị ga:

  • Ịhichapụ akaụntụ Ayoba gị kpamkpam
  • Hichapụ ozi niile inwere
  • Wepụ gị ozigbo n’otu Ayoba niile ị nọ

Ihe ndị ụfọdụ dị mkpa ị ga-ebu n’uche:

  • Igaghị enwe ohere ibanye na akaụnt gị
  • Ihichapụ akaụntụ gị adịghị emetụta ozi ndị ojiarụ ndị ọzọ nwere metụtara gị, dị ka ozi ndị ị zigaara ha
  • Kọpị nke ụfọdụ ihe (dịka ndekọ lọọg) nwere ike ịnọgide na nchekwa data anyị mana ejikoighi ya na njirimara onye nwe ya.

Enwere m ike itinye Ayoba n’ekwentị ọhụrụ m?

Ọ bụrụ na ị na-agbanwe ụdị ekwentị, ma debe nọmba gị, ị ga-edebe ozi akaụntụ gị. Ejikọtara ozi gbasara akaụntụ gị na nọmba ekwentị ahụ. Naanị nbudata Ayoba na ekwentị ọhụrụ ma nyochaa nọmba gị.

Ọ bụrụ na ị na-ebugharị site n’otu ụdị ekwentị gaa na onye ọzọ ma ghara ichebe nọmba gị, budata Ayoba na ekwentị ọhụrụ ma nyochaa nọmba ekwentị ọhuru.

Kedụ ka m ga-esi gbanwee asụsụ Ayoba?

I ji gbanwee asụsụ ekwentị gị:

Android: Gaa na Ntọala ekwentị gị > Sistem > Asụsụ & ndeba > Asụsụ. Kpatụ ma họrọ asụsụ.

Ọ bụrụ na ị na-eji ekwentị Android, ị nwekwara ike ịgbanwe asụsụ Ayoba site n’ime ngwa ahụ. Iji mee nke a, kpatụ menu aka ma họrọ Ntọala ma kpatụ Nlekọta aka.

EGO OLE HA PỤTARA

Ego ole ojiarụ Ayoba ga-akwụ

Ego ole ka e ji ezipụ ozi ma ọ bụ faịlụ mịdia na Ayoba?

Ayoba na-eji njikọ ịntanet nke ekwentị gị (4G/3G/2G/EDGE ma ọ bụ Wi-fi) iji zipụ ma natakwa ozi ndị enyi na ezinụlọ gị. Ụgwọ data ole ejiri were zipụ ma natakwa ozi ga-esi na ụdịrị ọda ịtụrụ na ndị nyere gị savis. ị ga-ejikwa n’aka na igafeghị data ole i kwesịrị ịji. Inwekwara ike iji Ayoba mee ihe mgbe ọbụla ịjikọrọ na netwọk Wi-fi nke nwere ike ị bụ n’efu.

Ayoba na MTN, ndị ọrụ ekwentị kasị ukwuu n’Africa, a gbakọọla aka i ji nye data n’efu* maka ndị ahịa MTN (n’okpuru iwu mabidoro mmefu). Nke a pụtara na ndị ahịa MTN ga-enwe ike izipu ma nata ozi ederede, ọdịyo, vidiyo, foto na faịlụ n’ime ngwa Ayoba n’ akwughị ugwọ data ọzọ ọ bụla.

*N’oge a na-eme nkwalite

Ego ole ka ọ pụtara i ji kpọọ oku olu na Ayoba? 

Ị nwere ike ịsite na ngwa Ayoba kpọọ kọntaktị gị ọ bụla oku olu na Ayoba. I ga-akwụ ụgwọ oku ahụ ka e si agwụ ụgwọ oku nke na-esi n’ego ole i nwere ọ bụ minit dị n’ekwentị gị. N’ụzọ dị oke mkpa, ịkpọ oku n’ime ngwa anaghị eji data ya na ọ bụghị n’efu.

Anaghị ekwe ọnụ na Ayoba

Ekwesịrị m ịnweta ngwa Ayoba iji ziga ma nata ozi n’aka ndị enyi na ezinụlọ ndị na-eji Ayoba?

Ayoba na-arụ ọrụ kacha mma mgbe gị na onye ọzọ nwere Ayoba na ekwentị ha na-ekwurịta okwu. Ka osila dị, anyị emeela mgbalị pụrụ iche iji nabata onye ọ bụla, n’adịghị ka ngwa nzị ozi ndị ọzọ, gị na onye ọbụla nwere ike ikarịta n’agbanyeghị ma ha nwere ngwa Ayoba ma ọ bụ na ha enweghị.

Ozi e si na Ayoba were zigara ndi kọntaktị gị ndị na-enweghị ngwa Ayoba, ga-enyefe ya kọntaktị gị dịka ozi ederede SMS, ma nwekwaa njikọ iji lee foto ma ọ bụ faịlụ na nlenyeanya ha.

N’ọtụtụ mba, mgbakọ aka anyị na MTN pụtara na ọ bụrụ na kọntaktị gị bụ onye debanyere aha MTN, ha nwere ike ịza ozi gị site na iji SMS ma ị ga-enweta nzaghachi ahụ n’amaghị ama na ngwa Ayoba gị. Mgbakọ anyị na MTN pụtara na nzaghachi SMS niile ndị a ga-abụ n’efu.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na kọntaktị gị abụghị onye debanyere aha na MTN, ha ka ga-enwe ike ịnata ozi gị site na Ayoba site na SMS ederede, mana agaghị enwe ike ịzaghachi ozi ahụ. A ga-agwa ha banyere njedebe a. Ihe ngwọta kachasị mma n’oge a bụ maka kọntaktị gị iji budata ngwa Ayoba.

Kedụ ihe o ga-ewe m ma ọ bụrụ na mụ enweghị ngwa Ayoba na ngwọrụ m?

Ọ bụrụ na ị bụ onye ojiarụ MTN ma ị nweghị ngwa Ayoba na ekwentị gị ị nwere ike ịzaghachi ozi SMS ederede nke sitere n’aka ndị ojiarụ Ayoba ya na nzaghachi SMS gị ga-abụ n’efu.

Ọ bụrụ na ị bụghị onye ojiarụ MTN, ị ga-enweta ozi Ayoba site na SMS ederede ma ị gaghị enwe ike ịzaghachi. Nwee ahụmahụ Ayoba zuru ezu site na ị budata ngwa ahụ na Play Store ma ọ bụ na Ayoba.me/download.

Data efu ga-adị mgbe a na-eme nkwalite. Enwekwara ike itinye iwu ga-egbochi mmefu.

Ọ bụrụ na ị bụ onye ojiarụ MTN ị nwere ike ibudata Ayoba n’efu, ugbu a na Ayoba.me/download. Ma ọ bụ ị nwere ike ịga na Google Play Store

NCHEKWA

Ọ dị nchekwa ịji Ayoba?

Maka ichekwa data gị nakwa ịhụ maka nzuzo gị, Ayoba tinyere ndenye ezoreezo ozi ọkaibe ya. Nke a ga-eme ka naanị gị na onye (ma ọ bụ ndị mmadụ) ị na – akparịta ụka ga-agụ ihe ezigara. Onweghi onye ozo puru igu ozi gi, obughi ndi otu n’Ayoba.

Anyị agaghị echefu ịgwa gị na anyị agaghị eme ka onye nke atọ nwee ike hụ ihe gbasara gị na-ebughị ụzọ nata gị ikike. Ị nwere ike ijikwa mwube nzuzo gị n’ime ngwa ahụ site na ịhọrọ Ị zi ozi na Ntọala menu, wee pịa Nzuzo. Anyị na-atụ aro ka ị nyochaa amụma Nzuzo anyị na Ayoba.me/termsandconditions.

Ekwentị furu efu na nke e zuru ezu

Ekwentị m furu efu ma ọ bụ na-ezuru ya ezu, kedụ ihe m kwesịrị ime ugbua?

  • Ọ bụrụ na ekwentị gị furu efu ma ọ bụ zuru, anyị nwere ike inyere gị aka ịchekwa akaụntụ Ayoba site na ojiji na-enweghị ikike. Biko soro usoro n’okpuru
  • Anyị na-akwado ka ị kpọọ ndị na-ahụ banyere ekwentị gị ngwa ngwa o kwere omume iji igbachi kaadị SIM gị ma gbochie onye ọzọ iji ekwentị gị. Mgbe akpọchiri SIM gị, ịnweghị ike iji nọmba ahụ nyochaa akaụntụ Ayoba gị, ebe ọ bụ na kwesirị ịnweta SMS iji mezue nyocha.

Ụzọ nhọrọ abụọ ka e nwere:

  • Jiri kaadi SIM ohuru na nọmba ahụ i ji were mee ka Ayoba rụwa ọrụ n’ekwentị ọhụrụ gị. Nke a bụ ụzọ kachasị ọsọ iji wepu akaụntụ gị na ekwentị e zuru ezu. Enwere ike iji Ayoba rụọ ọrụ na naanị otu nọmba ekwentị n’otu ngwaọrụ n’otu oge.
  • Kpọtụrụ anyị na Ayoba.me/help ma dekwaa n’ akwụkwọ nzaghachi ya na nkebi ahịrị “Ekwentị furu efu / E zuru ezu n’isi ya. Biko kpochapụ akaụntụ m” ma tinye nọmba ekwentị gị na usoro zuru ụwa ọnụ dị ka akọwara ebe a.

Mara na Ọ dị mkpa icheta na ọbụlagodi na akpọchiri kaadị SIM gị, ọ bụrụ na mmadụ nwere ike ịnweta ohere na ekwentị gị yana ngwa Ayoba, enwere ike iji ya na netwọk Wi-Fi. Ndị otu Ayoba enweghị ike iwepu Ayoba nke dị ebe dị anya. Anyị na-akwado gị ka ị kpọtụrụ anyị maka arịrịọ ime ka akaụnt gị kwụsị ọrụ ozugbo ịnwere ike.

Mara na ndị otu Ayoba anaghị enweta ohere imata ọnọdụ ekwentị gị ma anyị enweghị ike inyere gị aka ịchọta ekwentị gị. Ekwentị gị nwere ike ịnweta ngwa nke nwere ike inyere gị aka ịme nke a site na ngwaọrụ ọzọ..

Ọ bụrụ na ịmere nkata gị ndabere tupu ekwentị gị efuo, ịnwere ike iweghatachi akụkọ nkata gị niile.

  • A na-eme Ndabere na akpaghị aka kwa awa 24 ọbụla, na-eji njikọ ịntanetị.
  • Ndị ọrụ enweghị ike ịbịdo ma ọ bụ gbanyụọ nkwado ndabere na mpaghara.
  • Ndị ojiarụ, nwere ike ịmepụta nkwado ndabere ọhụrụ site na ịkpatụ aka “Menu” > Ntọala > “Mmezi” > “Ndabere nkata”.
  • Akaụntụ nke ọ bụla nwere otu ndabere, mgbe imepụtara ndabere nkata ọhụrụ, a ga-edochi ndabere gị mbụ.
  • A na-eweghachi ndabere naanị mgbe i mechara usoro nbanye! Odi adi mgbe ikwenyechara na OTP.

Nchekwa gị

Enwere m ike ịripọọt ndịna na-ekwesịghị ekwesị?

 

Anyị chọrọ mgbe niile ịhụ maka nchekwa gị, biko ripọọt ndịna ọbụla na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ omume na Ayoba.me/contact, ma họrọ “Kpesa ndịna na-ekwesịghị ekwesị”. Anyị ga-enyocha ma mee ihe ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

Rịba ama na anyị enweghị ike ịkesonye gị nsonaazụ nyocha anyị, mana nwee obi ike na anyị ji ripọọt ndị ahụ niile kpọrọ ihe.

Enwere m ike ịdebanye mkpesa megide onye ojiarụ ọzọ?

Anyị na-ebute mkpa nchekwa nke ndị ojiarụ anyị uzo ma anyị anaghị anabata omume mkparị nke ndị ojiarụ anyị. Biko gaa na Ayoba.me/contact, wee họrọ “Ripọọt onye ojiarụ” nhọrọ. Anyị ga-enyocha ma mee ihe ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

Rịba ama na anyị enweghị ike ịkesonye gị nsonaazụ nyocha anyị, mana nwee obi ike na anyị ji ripọọt ndị ahụ niile kpọrọ ihe.

MKPARỊTA ỤKA NA AYOBA

Enwere m ike iji Ayoba kekọrịta nkọwa kọntaktị nke ndị kọntaktị m?

Ee ị nwere ike! Jiri + (aịkọn mkparịta ụka ọhụrụ) wee malite nkata ọhụrụ, wee kpatụ aịkọn mgbakwunye aka, ugbu a ị nwere ike họrọ kọntaktị, wee kpatụ kọntaktị ịchọrọ ịkekọrịta aka.

Enwere m ike izipu foto site na iji Ayoba?

Kesaa foto selfi kachaa masị gị site na Ayoba. Jiri + (aịkọn mkparịta ụka ọhụrụ) iji wee malite mkparịta ụka ọhụrụ, wee kpatụ aịkọn mgbakwunye aka, wee họrọ Ebengosi iji họta foto n’ebenchekwa ozi gị. Ị nwekwara ike ịkpatụ kamera aka iji se foto ma kesaa ya ozugbo.

Enwere m ike iji Ayoba kekọrịta ọnọdụ m?

Kekọrịta ndị kọntaktị gị ọnọdụ gị site naanị ịkpatụ + aka (aịkọn mkparịta ụka ọhụrụ) iji malite nkata ọhụrụ, wee kpatụ aịkọn mgbakwunye aka, wee họrọ Ọnọdụ.

Enwere m ike izipu ozi olu site na Ayoba?

Ị nwere ike iji Ayoba were zigara onye ojiarụ Ayoba ọzọ ozi olu dị mkpirikpi site na kpatụ aịkọn maịkrofon aka nke dị n’okpuru aka nri ihuenyo nkata gị . Inwekwara ike iji + (aịkọn mkparịta ụka ọhụrụ) wee kepụta nkata ozi ọhụrụ wee kpatụ aịkọn maịkrofon aka ma rekọọd ozi gị.

Achọrọ m izipu faịlụ ma ọ bụ dọkụment, enwere m ike iji Ayoba?

Zipu faịlụ site na ite naanị ịkpatụ + aka (aịkọn mkparịta ụka ọhụrụ) iji bido nkata ọhụrụ, kpatụ aịkọn mgbakwunye wee họrọ Faịlụ. Ugbu agagharịa na ngwaọrụ gị, họrọ faịlụ ma kesaa ya na kọntaktị gị.

Kedụ ka m ga-esi zachighaa ozi?

Kpatụ ozi ị chọrọ ịhụ aka. Ị ji zaghachi ya azụ, naanị kpatụ aka ebe a na-ede ozi n’okpuru ihuenyo ahụ wee denye nzaghachi gị ma pịa zipu. Ọdị mfe otu ahụ.

Enwere m ike ịkekọrịta ma ọ bụ zipu ozi na kọntaktị Ayoba m?

Ị nwere ike ịzigaa ozi, faịlụ ọdịyo, foto na kọntaktị site na ịpị ma jigide ozi nke ịchọrọ ịziaga, wee Kpatụ akụ nziga aka nke dị na n’elu n’akụkụ aka nri nke ihuenyo gị, wee họrọ kọntaktị ịchọrọ ịkesa. ozi ma pịa ziga. A ga-amachi ndịnaya dị ka “Ziagara”. Ị ga-enwetakwa ozi nke na-egosi na eziferela ozi ahụ.

Kedụ ka m ga-esi hichaa ozi ochie ma ọ bụ ozi ndị mụ achọghịzi?

Naanị kpatụ ma jide ozi ahụ na ihuenyo nkata ahụ, wee họrọ aịkọn ahịhịa dị n’elu ihuenyo ahụ wee kwenye na nhọrọ gị.

Enwere m ike ibugharị nkata m na lịstị ọbọiheọkpụ?

Mba, Ayoba enweghị ụzọ esị ebugharị nkata na lịstị ọbọiheọkpụ (n’oge a). Ọ bụrụ n ’ịchọrọ iwepụ nkata na lịstị nkata gị, ị nwere ike ime ya site na ihichapụ ya, n’agbanyeghi na nke a bụ nhichapụ na-adịgide adịgide ma ị gaghị enwe ike iweghachite ya ma emesịa.

Enwere m ike ịhọcha nkata m na ụzọ dị iche iche?

A na-ahazi nkata gị oge niile dịka nke kachasị ọhụrụ, nkata ndị a na-apụta n’elu lịstị ahụ. Ịgaghị enwe ike igbanwe usoro a na Ayoba (ugbu a).

Kedụ ka m ga-esi hichapụ ozi?

N’ime ihuenyo Ayoba nke mbụ, kpatụ ma jide nkata ịchọrọ ihichapụ, wee họrọ aịkọn ahịhịa dị n’elu ihuenyo ahụ wee kwenye na nhọrọ gị.

Kedu otu m ga-esi kepụta nkata otu ma kpọọ ndị kọntaktị m?

Kpatụ bọtịnụ nkata ọhụrụ + ma họrọ OTU ỌHỤRỤ, tinyezie kọntaktị ndị ịchọrọ ịgụnye na nkata otu gị. Ugbu a ihe niile ị ga-eme bụ ịmalite mkparịta ụka.

Ọ bụrụ na m chọrọ ịhapụ otu nkata?

Ị nwere ike ịpu nkata otu ọ bụla n’oge ọ bụla site naanị ịkpatụ aịkọn nkata otu aka nke dị n’elu ihuenyo nkata gị wee họrọ bọtịnụ HAPỤ OTU, wee kwenye na nhọrọ gị.

Ọ bụrụkwanụ na mchọrọ ihichapụ nkata otu?

Ị hichapu nkata otu pịa ma jigide nkata out ahụ na ihuenyo mbụ, wee họrọ aịkọn mkpofu ahihia ma kwenye na nhọrọ gị. Ị nwekwara ike họrọ ịhapụ otu ahụ n’oge a.

Ọ bụrụ na ihichapụ otu mkparịta ụka, ị ga-ehichapụ ozi otu naanị na ngwaọrụ nke gị, na ị gaghị ehichapụ nkata ahụ maka ndị ọzọ nọ n’otu out ahụ.

Kedụ ihe Onye Nwe Otu na-eme?

Onye Nwe Otu nwere ike ịkepụta otu, tinye ma ọ bụ wepụ mmadụ na ya.

Enwere m ike ime onye ọzọ Onye Nwe Otu?

Enweghi ike inyefe onye ọzọ njizi.

Anyị enwere ike inwekarị otu onye dịka Onye Nwe Otu?

Igaghị enwe ọtụtụ ndị mmadụ dịka ndị nwe ya.

Agụnyewo m na otu, enwere m ike ịhụ nkata gara aga?

Ọ bụrụ na etinyere gị na otu, ị gaghị enwe ike ihu ozi ọ bụla gara aga na kparịta ụka tupu ị sonyere ndị otu a

Ọ bụrụkwanụ na ọ dị m mkpa iweghachi akụkọ nkata m?

A na-eme ndabere na akpaghị aka kwa awa 24, naanị ma ọ bụrụ na ị nwere njikọ intanetị. Ịgaghị enwe ike gbanyụọ ndabere na akpaghị aka a.

Ga-amanye okike ndabere ọhụụ site na ịkpatụ ogwe menu aka, horọ Ntọala, ma Ndozi ya na Ndabere nkata. Nke a ga-echedo nkata gị n’urukpuru, ma nye gị ohere iweghachi akụkọ nkata gị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

Iji weghachite ndabere nkata gị site na ịkpatụ bọtịnụ menu aka, wee họrọ Ntọala, wee Kpatụ aka na Ntọala ma họrọ Ndabere nkata, wee weghachite ya.

Rịba ama na echedoghị ndabere gị na mpaghara ngwaọrụ gị, yabụ ị ga-achọ intanetị iji mee nkwado ndabere.

 

Enwere m ike ịme nbudata na akpaghị aka nke faịlụ e zitere m?

Atụmatụ Nbudata Akpaghị aka a GBAYỤỌLA. Ọ bụrụ n’ịchọrọ ibudata foto na vidiyo ị nwetara na Ayoba na akpaghị aka, ị nwere ike ị GBANYE nbudata akpaghị aka. Ị nwere ike ịme atụmatụ nbudata onwe rụwa ọrụ site na ịhọrọ menu, wee kpatụ Mịdia aka ma hazie nbudata akpaghị aka gị iji daba mkpa gị. Anyị na-akwado gị ka ị gbanyụọ nke a ma ọ bụrụ na ịnwere obere data.

Gị na ndị enweghị Ayoba ịkparịta ụka 

Mụ na ndị enweghị Ayoba enwere ike ịkparịta?

Ị nwere ike ịji Ayoba were zigara onye ọbụla ozi, ọbụlagodi na ha enweghị ngwa ahụ na ngwaọrụ ha. A ga-enweta ozi ezigara ndị na-ebudataghị ma debanye aha na Ayoba dị ka ozi ederede SMS, ma nwee njikọ iji lelee faịlụ na ọdịnaya ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ọdabara.

Anyị na ndị MTN agbakọọla aka, nke pụtara na ndị debanyere aha na MTN ga-enwe ike ịji SMS zaghachi ozi Ayoba SMS ederede, n’efu, ọbụlagodi ma ọ bụrụ na ha enweghị ngwa Ayoba akwakọnyere na ngwaọrụ ha. Ndị n’edebanyeghị aha na MTN ga-enweta ozi site na Ayoba dịka ozi SMS ederede, mana ha agaghị enwe ike ịzaghachi. Anyị na-akwado na ndị n’edebanyeghị aha na MTN ịbudata ngwa Ayoba n’efu na Ayoba.me/download ma ọ bụ na Google Play Store.

Enwere m ike itinye kọntaktị, ọbụlagodi ma ha anaghị eji Ayoba?

Mgbe ị n’ekepụta nkata ọhụrụ, kpatụ menu aka nke dị n’elu n’akuku aka nri. Wee mee ka Gosipụta kọntaktị SMS rụba ọrụ. Ị ga-enwe ike ịlele kọntaktị gị niile, ọbụlagodi ndị na-anaghị eji ngwa Ayoba.

Ọ bụrụ na kọntaktị ndị ahụ ebudatara ngwa Ayoba ma denye aha na nọmba ekwentị edepụtara na ngwa kọntaktị gị, ngwa Ayoba ga-emelite ọnọdụ ha na-akpaghị aka iji gosipụta na ha ga-enwe ike ịmekọrịta dịka onye ọrụ Ayoba zuru oke.

E nwere m ike izigara ndị kọntaktị na-ebudataghị ngwa Ayoba foto ma ọ bụ faịlụ?

Ị nwere ike izigara ndị kọntaktị gị na-ebudataghị ngwa Ayoba foto, vidiyo na njikọta. Ndị kọntaktị aga-enweta ozi nke SMS nke gunyere njikọ iji lelee ọdịnaya. Mara na ikiri na/ma ọ bụ nbudata ọdịnaya ahụ nwere ike ibute ebubo data site na ndị na ewetara gị netwọkụ.

Anatala m ozi Ayoba, mana enweghị m ngwa ahụ. Enwere m ike ịlele ozi ahụ?

Ị nwere ike ịlele ozi ederede na faịlụ ndị ojiarụ Ayoba zitere gị site na Ayoba, ọbụlagodi na ị budatabeghị ngwa Ayoba n’efu. Anyị na ndị MTN agbakọọla aka, nke pụtara na ndị debanyere aha na MTN ga-enwe ike ịzaghachi ozi Ayoba SMS ederede, n’efu, ọbụlagodi ma ọ bụrụ na ha enweghị ngwa Ayoba akwakọnyere na ngwaọrụ ha. Ndị n’edebanyeghị aha na MTN ga-enweta ozi site na Ayoba dịka SMS, mana ha agaghị enwe ike ịzaghachi. Anyị na-akwado na ndị n’edebanyeghị aha na MTN ịbudata ngwa Ayoba n’efu na Ayoba.me/download ma ọ bụ na Google Play Store.

NLEKỌTA KỌNTAKTỊ GỊ

Kedụ ka m ga-esi were tinye kọntaktị?

Naanị tinye nọmba kọntaktị ahụ na kọntaktị ekwentị gị. Ozugbo ikepụtara kọntaktị ọhụrụ ị nwere ike imeghe ngwa Ayoba, kpatụ aịkọn ozi ọhụrụ aka + wee họrọ kọntaktị ahụ ịchọrọ iso kparịta ụka.

Ngwa Ayoba ga-achọpụta ozugbo na kọntaktị ahụ ebudatala ma denye nọmba ekwentị ha na Ayoba. Ọ bụrụ na ọ bụghị, ha ga-apụta dị ka kọntaktị SMS n’ime Ayoba.

Kedụ ka m ga-esi hichapụ kọntaktị?

Ị nwere ike ihichapụ kọntaktị dị ka ị si eme ya, site na ngwa kọntaktị ekwentị gị. Mepee lịstị kọntaktị ekwentị gị, kpatụ aha kọntaktị ahụ aka wee pịa menu ahụ n’akụkụ n’aka nri. Họrọ hichapụ, ma kwenye nhọrọ gị.

Kedụ ka m ga- esi gbochi kọntaktị?

Ị nwere ike igbochi kọntaktị n’ime Ayoba naanị site na ikori wee kpatụ aịkọn menu aka nke dị na akuku elu n’aka nri. Họrọ Gbochie, wee kwenye na aka ọrụ gị. Ozugbo igbochiri kọntaktị, ịnweghị ike ịnweta ozi ma ọ bụ ọdịnaya site na kọntaktị ahụ ya na ọ nweghị ike ịhụ ọnọdụ gị. Ị gakwa enwe ike ihụ kọntaktị ahụ na listi kọntaktị gị, mana ị ga-akara ka “Gbochiri”. Ọ bụrụ na-ịchọrọ izipu ma nata ozi site na kọntaktị igbochiri , ị gakwa ewepụ mgbochi kọntaktị ahụ.

Anyị chọrọ ịhụ maka nchekwa gị mgbe niile, yabụ biko rịpọọt ọdịnaya ọ bụla na-adịghị mma ma ọ bụ omume na Ayoba.me/contact, ma ọ bụ zoo aka na <Security FAQ Section> ebe a

Kedu otu m ga-esi wepụ mgbochi kọntaktị?

Ị nwere ike ịwepụ mgbochi ịgbochiri kọntaktị na mbụ site na ịji aịkọn + kepụta nkata ọhụrụ, họrọ kọntaktị ahụ, jiri menu nke dị na akuku elu n’aka nri wee kpatpụ Wepụ Mgbochi aka, wee kwenye na ihe ị na-eme. Ugbu a gị na kọntaktị ahụ ga-enwe ike ikwurita, kọntaktị a ga-enwe ike izipu ozi ọhụrụ ma zaghachi ozi gị ma hụ ọnọdụ gị.

Kedụ ka m ga-esi were kpọọ oku olu na Ayoba?

Ị nwere ike ịkpọ kọntaktị gị ọ bụla oku olu site na ngwa Ayoba. A ga-ewere ego ya ka e si ewere ego oku ndị ọzọ ma jiri ego ole ma ọ bụ nkeji ị nwere. Dị oke mkpa, ịkpọ oku n’ime ngwa anaghị eji data ya na ọbụghị n’efu. Iji jiri Ayoba kpọọ oku olu, kpatụ nke + (aịkọn mkparịta ụka ọhụrụ) wee pịa aịkọn ekwentị ahụ iji kpọọ oku olu.